4Onyenwe anyị gwara ya, “Aha ị ga-agụ nwantakịrị ahụ bụ Jezril. Nʼihi na tupu nwa oge nta agafee, aga m ata ezinaụlọ Jehu ahụhụ nʼihi ọbara ọ wụsiri na Jezril. Aga m eme ka alaeze nke ụlọ Izrel kwụsị.
5Nʼụbọchị ahụ, aga m agbaji ụta Izrel na Ndagwurugwu Jezril.”
6Emesịa, Goma tụụrụ ime ọzọ, mụta nwa nwanyị. Ọ gwara ya, “Aha ị ga-agụ ya bụ Lo-Ruhama, nʼihi na agaghị m enwekwa obi ebere ọzọ nʼahụ ụlọ Izrel, ịgbaghara ha mmehie ha.
7Ma aga m enwe obi ebere nʼahụ ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-azọpụta ha site na Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Agaghị m eji ngwa agha ọbụla, dịka ụta maọbụ mma agha maọbụ ike ibu agha maọbụ ịnyịnya maọbụ ndị na-agba ịnyịnya zọpụta ha.”
8Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke.