5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
7Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.
8Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.
9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.