Aịzaya 1

Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.

Isaiah 1:10 (UKJV) Hear the word of the LORD, all of you rulers of Sodom; give ear unto the law of our God, all of you people of Gomorrah.

8Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.

9Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.

10Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.

11“Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja, gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?” ka Onyenwe anyị sịrị. “Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ; Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi adịghị atọkwa m ụtọ.

12Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m, onye chọrọ nke a nʼaka unu? Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.