Aịzaya 1

Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.

Isaiah 1:23 (UKJV) Your princes are rebellious, and companions of thieves: every one loves gifts, and follows after rewards: they judge not the fatherless, neither does the cause of the widow come unto them.

21Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.

22Ọlaọcha gị aghọọla unyi, ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke.

23Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.

24Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.

25Aka m ga-abịakwasị unu. Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo, si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.