Aịzaya 1

Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie, ndị ajọ omume riri ahụ, ụmụ ndị ajọ omume, ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ! Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel, ha agbakụtala ya azụ ha.

Isaiah 1:4 (UKJV) Ah sinful nation, a people laden with iniquity, a seed of evildoers, children that are corrupters: they have forsaken the LORD, they have provoked the Holy One of Israel unto anger, they are gone away backward.

2Gee ntị, gị eluigwe, gee ntị, gị ụwa! Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola okwu: “Azụrụ m ụmụntakịrị, zụlite ha, ma ha enupula isi megide m.

3Ehi maara onyenwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri, ma Izrel amaghị m, ndị m adịghị aghọtakwa.”

4Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie, ndị ajọ omume riri ahụ, ụmụ ndị ajọ omume, ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ! Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel, ha agbakụtala ya azụ ha.

5Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.

6O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke, site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu; ọnya, na ntihịa ahụ, na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ; e kechikwaghị ha, e tekwaghị ha mmanụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.