4Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya, nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe, ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo, nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka, tinye nʼọnụ ya, loo ha.
5Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya, ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ okpueze mara mma, ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma.
6Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi nye ndị ikpe. Ọ ga-abụkwa ike nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama.
7Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.
8Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi. O nwekwaghị ebe dị ọcha.