9Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.
10Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.
11Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha.
12Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.
13Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.