12Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.
13Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.
14Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
15Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.