23ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile.
24Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
25Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo, ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.
26Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.