5Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.
6Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.”
8Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa. Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
9Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.