8Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
9Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Mgbe ọ nụrụ nke a, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,
10“Gwanụ Hezekaya, eze Juda: Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’
11Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?
12Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa?