Aịzaya 37

Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.

Isaiah 37:17 (UKJV) Incline yours ear, O LORD, and hear; open yours eyes, O LORD, and see: and hear all the words of Sennacherib, which has sent to reproach the living God.

15Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị:

16“O, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.

17Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.

18“Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu,

19ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.