36Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.
37Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
38Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.