Aịzaya 37

Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”

Isaiah 37:7 (UKJV) Behold, I will send a blast upon him, and he shall hear a rumour, and return to his own land; and I will cause him to fall by the sword in his own land.

5Mgbe ndị ọrụ eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,

6ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.

7Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”

8Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.

9Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Mgbe ọ nụrụ nke a, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.