Aịzaya 53

Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.

Isaiah 53:2 (UKJV) For he shall grow up before him as a tender plant, and as a root out of a dry ground: he has no form nor loveliness; and when we shall see him, there is no beauty that we should desire him.

1Onye kweere ozi anyị, ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?

2Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome, dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ. O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya. O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.

3Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.

4Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru, burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile, ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.