8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?
9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere; ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya, ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile. Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị.
10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.
12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha.