Aịzaya 61

Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.

Isaiah 61:1 (UKJV) The Spirit of the Lord GOD is upon me; because the LORD has anointed me to preach good tidings unto the meek; he has sent me to bind up the brokenhearted, to proclaim liberty to the captives, and the opening of the prison to them that are bound;

1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.

2O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ, na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị. O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi,

3na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha. O zitere m inye ha okpueze mara mma nʼọnọdụ ntụ, inye ha ọṅụ, nʼọnọdụ ịkwa akwa, na iyikwasị ha mmụọ otuto nʼọnọdụ mmụọ ịda mba. Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha, dịka osisi ook siri ike, igosi ịma mma Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.