Aịzaya 61

Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi.

Isaiah 61:7 (UKJV) For your shame all of you shall have double; and for confusion they shall rejoice in their portion: therefore in their land they shall possess the double: everlasting joy shall be unto them.

5Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu; ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile.

6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị, kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị. A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu. Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi.

7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi.

8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya. Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị. Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara, mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi.

9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama, a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile. Ndị niile hụrụ ha ga-amata, kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.