Aịzaya 62

Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị.

Isaiah 62:2 (UKJV) And the Gentiles shall see your righteousness, and all kings your glory: and you shall be called by a new name, which the mouth of the LORD shall name.

1Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu.

2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị.

3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị.

4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.