Aịzaya 65

Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike.

Isaiah 65:10 (UKJV) And Sharon shall be a fold of flocks, and the valley of Achor a place for the herds to lie down in, for my people that have sought me.

8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile.

9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.

10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike.

11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.

12Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.