Aịzaya 65

Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ nye ndị na-enupu isi, bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,

Isaiah 65:2 (UKJV) I have spread out my hands all the day unto a rebellious people, which walks in a way that was not good, after their own thoughts;

1“Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m. Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m. Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m, asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’

2Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ nye ndị na-enupu isi, bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,

3ndị na-anọgide na-akpasu m iwe nʼihu m mgbe niile, ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige, nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,

4ndị na-anọdụ nʼetiti ili, ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche; ndị na-eri anụ ezi, ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.