19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa.
20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-adị nʼebe ahụ ọzọ, a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya; nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ dị ka nwantakịrị; a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ dịka onye a bụrụ ọnụ.
21Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya; ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.
22Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ, maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie. Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge. Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.
23Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ. Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri, ha na ụmụ ụmụ ha.