23Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ. Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri, ha na ụmụ ụmụ ha.
24Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha. Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.
25Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe, ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi, ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja! Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ, maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.” Ka Onyenwe anyị kwuru.