Aịzaya 65

Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”

Isaiah 65:7 (UKJV) Your iniquities, and the iniquities of your fathers together, says the LORD, which have burned incense upon the mountains, and blasphemed me upon the hills: therefore will I measure their former work into their bosom.

5ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso, nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’ Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m. Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.

6“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha.

7Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”

8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile.

9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.