Aịzaya 66

“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Isaiah 66:17 (UKJV) They that sanctify themselves, and purify themselves in the gardens behind one tree in the midst, eating swine's flesh, and the abomination, and the mouse, shall be consumed together, says the LORD.

15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.

16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya kpee ndị mmadụ niile ikpe. Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.

17“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

18“Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.

19“Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya, na Lidiya (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.