13Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?
14Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.
15Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe.
16Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha.
17Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.”