17Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.”
18Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa.
19Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile.
20Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile.
21Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ.