1Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike.
2Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe.
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa.
4Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya.