19Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ?
20Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha.
21Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha.
22Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị.