Jemis 1

O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.

James 1:24 (UKJV) For he beholds himself, and goes his way, and immediately forgets what manner of man he was.

22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.

23Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo.

24O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.

25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.

26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.