11Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu.
12Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha.
13Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.
14Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya?
15Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị,