16ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara?
17Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya.
18Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ
19I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja.
20Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya?