Jemis 2

Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke.

James 2:22 (UKJV) See you how faith wrought with his works, and by works was faith made perfect?

20Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya?

21Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja?

22Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke.

23Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke.

24Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.