24Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe.
25Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche?
26Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.