4ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe?
5Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya?
6Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe?
7Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu?
8Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.