7Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu?
8Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.
9Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu.
10Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara.
11Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu.