14Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu.
15Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ.
16Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị.
17Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
18Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume.