4Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.
5Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ.
6Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ.
7Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri;
8ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.