9Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ.
10Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.
11Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe.
12Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
13Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”