14Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.
15Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.”
16Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ.
17Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.