Jemis 5

Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ,

James 5:19 (UKJV) Brethren, if any of you do go astray from the truth, and one convert him;

17Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii.

18Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.

19Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ,

20chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.