Jemis 5

Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.

James 5:8 (UKJV) Be all of you also patient; establish your hearts: for the coming of the Lord draws nigh.

6Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu.

7Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya.

8Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.

9Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ.

10Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.