Jeremaya 11

Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a,

Jeremiah 11:3 (UKJV) And say you unto them, Thus says the LORD God of Israel; Cursed be the man that obeys not the words of this covenant,

1Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya,

2“Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem.

3Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a,

4bụ nke m nyere nna nna unu ha, mgbe m si nʼIjipt, site nʼoke ọkụ e ji agbaze igwe, kpọpụta ha.’ Asịrị m, Ruberenụ m isi, meekwa ihe niile m nyere unu nʼiwu, unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụkwa Chineke unu.

5‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.” Azara m sị, “Amen, Onyenwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.