Jeremaya 11

Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.”

Jeremiah 11:7 (UKJV) For I earnestly protested unto your fathers in the day that I brought them up out of the land of Egypt, even unto this day, rising early and protesting, saying, Obey my voice.

5‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.” Azara m sị, “Amen, Onyenwe anyị.”

6Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru.

7Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.”

8Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’ ”

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Achọpụtala na-enwere njikọta na ịgba izu mmegide nʼetiti ndị Juda na ndị bi na Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.