Jeremaya 12

Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.

Jeremiah 12:15 (UKJV) And it shall come to pass, after that I have plucked them out I will return, and have compassion on them, and will bring them again, every man to his heritage, and every man to his land.

13Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha. Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla. Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu, nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”

14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda.

15Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.

16Ọ bụrụkwa na ha amụta ụzọ niile nke ndị m nke ọma, na iji aha m ṅụọ iyi, na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ dịka ha si kuziere ndị m iji aha Baal na-aṅụ iyi, aga m eme ka ha guzosie ike nʼetiti ndị m.

17Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.