1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.”
2Ejere m zụta ajị ahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m.
3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m,
4“Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.”