13Ma asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Lee na ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha anya, maọbụ hụ ahụhụ nke ụnwụ na-eweta, nʼeziokwu, aga m enye unu udo nke na-adịgide adịgide nʼebe a.’ ”
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara.
15Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma nʼaha m. Ọ bụghị m ziteere ha, ma ha nọgidere na-asị, ‘Mma agha na ụnwụ enweghị ike ịbịaru ala a nso.’ Ndị amụma a niile ka a ga-ebibi site na mma agha na ụnwụ.
16A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.
17“Gwa ha okwu ndị a, “ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị, nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke, ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu, ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ.