7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama, Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị. Anyị emehiela megide gị. Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.
8Gị, onye bụ olileanya Izrel. Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ, gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a, dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị?
9Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede, dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta? Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị; ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị. Ahapụkwala anyị!
10Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a, “Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu. Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe. Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ. Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha, ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a.