12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe, ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?
13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile.
14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.”
15Ị maara O Onyenwe anyị, ya mere cheta m, lekọtaakwa m. Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m. Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi. Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.
16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri. Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ, nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.