9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?
10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”
11Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị, otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị. Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha. Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.
12Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ.
13Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.